Jenesis 14:19
Genesis 14:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ọ gọziri Ebram sị ya, “Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa.
Genesis 14:19 in English
Genesis 14:19 · Berean Standard Bible
and he blessed Abram and said: “Blessed be Abram by God Most High, Creator of heaven and earth,
Context
17Mgbe Ebram si na mmeri ahụ o meriri Kedoloma na eze ndị ọzọ ahụ na-alọta, eze Sọdọm bịara zute ya na Ndagwurugwu Shave (nke a na-akpọ Ndagwurugwu Eze). 18Melkizedek, eze* Salem, onye nchụaja Chineke nke kachasị ihe niile elu, wepụtara achịcha na mmanya, 19ọ gọziri Ebram sị ya,
“Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu,
Onye kere eluigwe na ụwa. 20Ngọzị dịkwara Chineke nke kachasị ihe niile elu,
onye weere ndị iro gị nyefee gị nʼaka.”
Mgbe ahụ, Ebram nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. 21Eze Sọdọm gwara Ebram sị, “Nyeghachi m naanị ndị mmadụ, ma debere onwe gị ihe ndị ọzọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.