Jenesis 14:17
Genesis 14:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Ebram si na mmeri ahụ o meriri Kedoloma na eze ndị ọzọ ahụ na-alọta, eze Sọdọm bịara zute ya na Ndagwurugwu Shave (nke a na-akpọ Ndagwurugwu Eze).
Genesis 14:17 in English
Genesis 14:17 · Berean Standard Bible
After Abram returned from defeating Chedorlaomer and the kings allied with him, the king of Sodom went out to meet him in the Valley of Shaveh (that is, the King’s Valley).
Context
15Nʼabalị, Ebram kere ndị agha ya ibuso ndị ahụ agha. O meriri ha, chụọ ha ọsọ, chụruo ha Hoba, nke dị nʼakụkụ ugwu Damaskọs. 16Ebram nwetaghachiri ihe niile ahụ ha dọtara nʼagha, dulata nwanne ya Lọt, na ihe onwunwe ya niile, tinyere ndị inyom, na ndị ọzọ niile a dọtara nʼagha. 17Mgbe Ebram si na mmeri ahụ o meriri Kedoloma na eze ndị ọzọ ahụ na-alọta, eze Sọdọm bịara zute ya na Ndagwurugwu Shave (nke a na-akpọ Ndagwurugwu Eze). 18Melkizedek, eze* Salem, onye nchụaja Chineke nke kachasị ihe niile elu, wepụtara achịcha na mmanya, 19ọ gọziri Ebram sị ya,
“Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu,
Onye kere eluigwe na ụwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.