Jenesis 14:21
Genesis 14:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze Sọdọm gwara Ebram sị, “Nyeghachi m naanị ndị mmadụ, ma debere onwe gị ihe ndị ọzọ.”
Genesis 14:21 in English
Genesis 14:21 · Berean Standard Bible
The king of Sodom said to Abram, “Give me the people, but take the goods for yourself.”
Context
19ọ gọziri Ebram sị ya,
“Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu,
Onye kere eluigwe na ụwa. 20Ngọzị dịkwara Chineke nke kachasị ihe niile elu,
onye weere ndị iro gị nyefee gị nʼaka.”
Mgbe ahụ, Ebram nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. 21Eze Sọdọm gwara Ebram sị, “Nyeghachi m naanị ndị mmadụ, ma debere onwe gị ihe ndị ọzọ.” 22Ma Ebram zara eze Sọdọm sị, “Eweliri m aka m elu ṅụọ iyi nye Onyenwe anyị Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa, sị 23na agaghị m esi nʼaka gị were ihe ọbụla bụ nke gị, ọ bụladị eriri maọbụ eriri akpụkpọụkwụ. Ka ị ghara ị sị, ‘Ọ bụ m mere ka Ebram baa ọgaranya.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.