Jenesis 14:22
Genesis 14:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Ebram zara eze Sọdọm sị, “Eweliri m aka m elu ṅụọ iyi nye Onyenwe anyị Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa, sị
Genesis 14:22 in English
Genesis 14:22 · Berean Standard Bible
But Abram replied to the king of Sodom, “I have raised my hand to the LORD God Most High, Creator of heaven and earth,
Context
20Ngọzị dịkwara Chineke nke kachasị ihe niile elu,
onye weere ndị iro gị nyefee gị nʼaka.”
Mgbe ahụ, Ebram nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. 21Eze Sọdọm gwara Ebram sị, “Nyeghachi m naanị ndị mmadụ, ma debere onwe gị ihe ndị ọzọ.” 22Ma Ebram zara eze Sọdọm sị, “Eweliri m aka m elu ṅụọ iyi nye Onyenwe anyị Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa, sị 23na agaghị m esi nʼaka gị were ihe ọbụla bụ nke gị, ọ bụladị eriri maọbụ eriri akpụkpọụkwụ. Ka ị ghara ị sị, ‘Ọ bụ m mere ka Ebram baa ọgaranya.’ 24Naanị ihe m ga-anara bụ ihe ụmụ okorobịa m ndị a riri, ya na oke ruuru Anea, na Eshkọl, na Mamre so m gaa. Nye ha oke ruuru ha.”
14:5 Refaim Aha a Refaim pụtara ndị ọ gbaa dimkpa Jen 15:20
14:18 Salem Eleghị anya, nke bụ aha ochie e ji mara obodo Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.