Jenesis 11:10
Genesis 11:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Shem. Mgbe afọ abụọ gafechara site nʼoge uju mmiri ahụ, nʼoge Shem gbara narị afọ, ọ mụtara Apakshad.
Genesis 11:10 in English
Genesis 11:10 · Berean Standard Bible
This is the account of Shem. Two years after the flood, when Shem was 100 years old, he became the father of Arphaxad.
Context
8Onyenwe anyị mere ka ha gbasaa nʼelu ụwa niile. Ha kwụsịkwara iwu obodo ahụ. 9Ọ bụkwa nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel* nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị wetara ọgbaaghara nʼasụsụ ndị niile bi nʼụwa. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị si gbasasịa ha nʼelu ụwa dum. 10Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Shem.
Mgbe afọ abụọ gafechara site nʼoge uju mmiri ahụ, nʼoge Shem gbara narị afọ, ọ mụtara Apakshad. 11Shem dịrị ndụ, mgbe ọ mụsịrị Apakshad, narị afọ ise ọzọ, mụtakwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 12Mgbe Apakshad gbara iri afọ atọ na ise, ọ mụtara Shela.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.