Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Sairọs bụ eze Peshịa, chịpụtara ha site nʼaka Mitredat, onye bụ odozi akụ, onye gụrụ ha ọnụ nye Sheshbaza, onye bụ onyeisi ndị Juu ahụ na-alaghachi Jerusalem na Juda.

Ezra 1:8 in English

Ezra 1:8 · Berean Standard Bible

Cyrus king of Persia had them brought out by the hand of Mithredath the treasurer, who counted them out to Sheshbazzar the prince of Judah.*

Context

6Ndị Juu bi na gburugburu Peshịa nyere ndị nke na-alaghachi Jerusalem onyinye ihe ọlaọcha na ọlaedo, na anụ ụlọ na ihe ndị ọzọ, na onyinye dị oke ọnụahịa dị iche iche, tinyere onyinye afọ ofufu ha. 7Nke ka nke, eze Sairọs chịpụtara ọtụtụ ngwongwo nke ụlọnsọ Onyenwe anyị nke Nebukadneza sitere na Jerusalem bukọrọ gaa debe nʼụlọ chi ya. 8Sairọs bụ eze Peshịa, chịpụtara ha site nʼaka Mitredat, onye bụ odozi akụ, onye gụrụ ha ọnụ nye Sheshbaza, onye bụ onyeisi ndị Juu ahụ na-alaghachi Jerusalem na Juda. 9Nke a bụ ọnụọgụgụ ngwongwo ndị ahụ: efere ọlaedo iri atọ (30), efere ọlaọcha otu puku (1,000), efere ọlaọcha iri abụọ na itoolu (29), 10efere nta ọlaedo iri atọ (30), efere ọlaọcha nta narị anọ na iri (410), ngwongwo ndị ọzọ otu puku (1,000).

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.