Ezra 1:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
efere nta ọlaedo iri atọ (30), efere ọlaọcha nta narị anọ na iri (410), ngwongwo ndị ọzọ otu puku (1,000).
Ezra 1:10 in English
Ezra 1:10 · Berean Standard Bible
30 gold bowls, 410 matching silver bowls, and 1,000 other articles.
Context
8Sairọs bụ eze Peshịa, chịpụtara ha site nʼaka Mitredat, onye bụ odozi akụ, onye gụrụ ha ọnụ nye Sheshbaza, onye bụ onyeisi ndị Juu ahụ na-alaghachi Jerusalem na Juda. 9Nke a bụ ọnụọgụgụ ngwongwo ndị ahụ:
efere ọlaedo iri atọ (30),
efere ọlaọcha otu puku (1,000),
efere ọlaọcha iri abụọ na itoolu (29), 10efere nta ọlaedo iri atọ (30),
efere ọlaọcha nta narị anọ na iri (410),
ngwongwo ndị ọzọ otu puku (1,000). 11Nʼime ihe ndị a niile, ọnụọgụgụ ihe e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ dị puku ise na narị anọ (5,400).
Sheshbaza bulatara ihe ndị a mgbe ya na ndị ahụ a dọọrọ nʼagha hapụrụ Babilọn na-alọta Jerusalem.
1:2 Alaeze Sairọs gbatịrị site nʼIndia jeruo Ijipt, ma sitekwa nʼebe dị warawara nʼosimiri Uhie ruo Kush.
1:5 Nke a bụ ogologo ụzọ dị narị kilomita itoolu maọbụ otu puku. Ọ ga-ewe onye ije ihe dịka ọnwa abụọ, maọbụ atọ iji ụgbọala nke ịnyịnya na-adọkpụ ruo Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.