Ezra 1:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke ka nke, eze Sairọs chịpụtara ọtụtụ ngwongwo nke ụlọnsọ Onyenwe anyị nke Nebukadneza sitere na Jerusalem bukọrọ gaa debe nʼụlọ chi ya.
Ezra 1:7 in English
Ezra 1:7 · Berean Standard Bible
King Cyrus also brought out the articles belonging to the house of the LORD that Nebuchadnezzar had carried away from Jerusalem and placed in the temple of his gods.
Context
5Mgbe ahụ, Chineke tinyere ọchịchọ ịlaghachi Jerusalem* nʼobi ndịisi ezinaụlọ Juda na Benjamin na ndị nchụaja, na ndị Livayị. Ha kwadokwara ịlaghachi maka ịrụ ọrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ na-atụfughị oge. 6Ndị Juu bi na gburugburu Peshịa nyere ndị nke na-alaghachi Jerusalem onyinye ihe ọlaọcha na ọlaedo, na anụ ụlọ na ihe ndị ọzọ, na onyinye dị oke ọnụahịa dị iche iche, tinyere onyinye afọ ofufu ha. 7Nke ka nke, eze Sairọs chịpụtara ọtụtụ ngwongwo nke ụlọnsọ Onyenwe anyị nke Nebukadneza sitere na Jerusalem bukọrọ gaa debe nʼụlọ chi ya. 8Sairọs bụ eze Peshịa, chịpụtara ha site nʼaka Mitredat, onye bụ odozi akụ, onye gụrụ ha ọnụ nye Sheshbaza, onye bụ onyeisi ndị Juu ahụ na-alaghachi Jerusalem na Juda. 9Nke a bụ ọnụọgụgụ ngwongwo ndị ahụ:
efere ọlaedo iri atọ (30),
efere ọlaọcha otu puku (1,000),
efere ọlaọcha iri abụọ na itoolu (29),
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.