Native Bible

Ezekiel 43:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebube Onyenwe anyị sitere nʼọnụ ụzọ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ bata nʼime ụlọnsọ ahụ.

Ezekiel 43:4 in English

Ezekiel 43:4 · Berean Standard Bible

and the glory of the LORD entered the temple through the gate facing east.

Context

2Ma lee, ahụrụ m ebube Chineke nke Izrel ka o si nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-apụta. Olu ya dị ka mbigbọ nke ebili mmiri, ebube ya nwukwara nʼala ahụ niile. 3Ọ dịkwa ka ọhụ mbụ m hụrụ, nke m buru ụzọ hụ nʼakụkụ ọnụ mmiri Keba, ya na nke m hụrụ na Jerusalem mgbe ọ bịara ibibi obodo ahụ. Adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja. 4Ebube Onyenwe anyị sitere nʼọnụ ụzọ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ bata nʼime ụlọnsọ ahụ. 5Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m bubata m nʼime ogige nke ime, ma ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ ukwu ahụ. 6Mgbe ahụ, anụrụ m olu ka o si nʼụlọnsọ ahụ na-agwa m okwu, dịka nwoke ahụ na-eguzokwa nʼakụkụ m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.