Native Bible

Ezekiel 43:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, anụrụ m olu ka o si nʼụlọnsọ ahụ na-agwa m okwu, dịka nwoke ahụ na-eguzokwa nʼakụkụ m.

Ezekiel 43:6 in English

Ezekiel 43:6 · Berean Standard Bible

While the man was standing beside me, I heard someone speaking to me from inside the temple,

Context

4Ebube Onyenwe anyị sitere nʼọnụ ụzọ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ bata nʼime ụlọnsọ ahụ. 5Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m bubata m nʼime ogige nke ime, ma ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ ukwu ahụ. 6Mgbe ahụ, anụrụ m olu ka o si nʼụlọnsọ ahụ na-agwa m okwu, dịka nwoke ahụ na-eguzokwa nʼakụkụ m. 7Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ebe a bụ ebe nke ocheeze, na ebe nke ọbụ ụkwụ m abụọ ga-anọgide, ebe a ka m ga-ebi nʼetiti ụmụ Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Ụlọ Izrel agaghị emerụkwa aha nsọ m ọzọ, ha onwe ha maọbụ ndị eze ha, site nʼikpere arụsị niile ha na ibubata onyinye olili ozu ndị eze ha, mgbe ha nwụrụ anwụ. 8Mgbe ha wuru mbata ọnụ ụzọ ha nʼakụkụ mbata ọnụ ụzọ m, tinye ọnụ ụzọ ha nʼakụkụ ọnụ ụzọ m, ọ bụkwa naanị mgbidi bụ ihe dị nʼetiti mụ na ha. Ha merụrụ aha nsọ m site nʼihe arụ niile ha mere. Ya mere m ji bibie ha nʼiwe m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.