Native Bible

Ezekiel 43:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma lee, ahụrụ m ebube Chineke nke Izrel ka o si nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-apụta. Olu ya dị ka mbigbọ nke ebili mmiri, ebube ya nwukwara nʼala ahụ niile.

Ezekiel 43:2 in English

Ezekiel 43:2 · Berean Standard Bible

and I saw the glory of the God of Israel coming from the east. His voice was like the roar of many waters, and the earth shone with His glory.

Context

1Emesịa, ọ kpọbatakwara m nʼọnụ ụzọ mbata nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ. 2Ma lee, ahụrụ m ebube Chineke nke Izrel ka o si nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-apụta. Olu ya dị ka mbigbọ nke ebili mmiri, ebube ya nwukwara nʼala ahụ niile. 3Ọ dịkwa ka ọhụ mbụ m hụrụ, nke m buru ụzọ hụ nʼakụkụ ọnụ mmiri Keba, ya na nke m hụrụ na Jerusalem mgbe ọ bịara ibibi obodo ahụ. Adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja. 4Ebube Onyenwe anyị sitere nʼọnụ ụzọ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ bata nʼime ụlọnsọ ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.