Izikiel 31:4
Ezekiel 31:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nwetara mmiri mere ka o buo ibu, na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo. Iyi ha niile na-asọ nʼokpuru ya. Ebe ahụ ka ha si ezipu ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri.
Ezekiel 31:4 in English
Ezekiel 31:4 · Berean Standard Bible
The waters made it grow; the deep springs made it tall, directing their streams all around its base and sending their channels to all the trees of the field.
Context
2“Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha,
“ ‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu? 3Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa,
nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya.
Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn,
nke jupụtara nʼalaka mara mma,
nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo,
nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile. 4O nwetara mmiri mere ka o buo ibu,
na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo.
Iyi ha niile
na-asọ nʼokpuru ya.
Ebe ahụ ka ha si ezipu
ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri. 5Nʼihi ya, o toro tokarịa
osisi niile nʼogologo.
Ngalaba ya bara ụba,
alaka ya topụkwara ogologo
nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta. 6Nʼalaka ya niile
ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ,
nʼokpuru ndo nke alaka ya niile
ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ,
oke mba niile dị iche iche
bikwara nʼokpuru ndo ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.