Izikiel 31:3
Ezekiel 31:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa, nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya. Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn, nke jupụtara nʼalaka mara mma, nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo, nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile.
Ezekiel 31:3 in English
Ezekiel 31:3 · Berean Standard Bible
Look at Assyria, a cedar in Lebanon, with beautiful branches that shaded the forest. It towered on high; its top was among the clouds.
Context
1O ruo, nʼafọ nke iri na otu, nʼọnwa nke atọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha,
“ ‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu? 3Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa,
nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya.
Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn,
nke jupụtara nʼalaka mara mma,
nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo,
nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile. 4O nwetara mmiri mere ka o buo ibu,
na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo.
Iyi ha niile
na-asọ nʼokpuru ya.
Ebe ahụ ka ha si ezipu
ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri. 5Nʼihi ya, o toro tokarịa
osisi niile nʼogologo.
Ngalaba ya bara ụba,
alaka ya topụkwara ogologo
nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.