Izikiel 31:2
Ezekiel 31:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha, “ ‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu?
Ezekiel 31:2 in English
Ezekiel 31:2 · Berean Standard Bible
“Son of man, say to Pharaoh king of Egypt and to his multitude: ‘Who can be compared to your greatness?
Context
1O ruo, nʼafọ nke iri na otu, nʼọnwa nke atọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha,
“ ‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu? 3Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa,
nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya.
Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn,
nke jupụtara nʼalaka mara mma,
nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo,
nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile. 4O nwetara mmiri mere ka o buo ibu,
na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo.
Iyi ha niile
na-asọ nʼokpuru ya.
Ebe ahụ ka ha si ezipu
ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.