Izikiel 31:6
Ezekiel 31:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼalaka ya niile ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ, nʼokpuru ndo nke alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ, oke mba niile dị iche iche bikwara nʼokpuru ndo ya.
Ezekiel 31:6 in English
Ezekiel 31:6 · Berean Standard Bible
All the birds of the air nested in its branches, and all the beasts of the field gave birth beneath its boughs; all the great nations lived in its shade.
Context
4O nwetara mmiri mere ka o buo ibu,
na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo.
Iyi ha niile
na-asọ nʼokpuru ya.
Ebe ahụ ka ha si ezipu
ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri. 5Nʼihi ya, o toro tokarịa
osisi niile nʼogologo.
Ngalaba ya bara ụba,
alaka ya topụkwara ogologo
nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta. 6Nʼalaka ya niile
ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ,
nʼokpuru ndo nke alaka ya niile
ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ,
oke mba niile dị iche iche
bikwara nʼokpuru ndo ya. 7Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya,
nʼogologo nke alaka ya nʼawasa,
nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba
nʼebe mmiri dị ukwuu. 8Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige
erughị ya nʼọtụtụ.
Ọ dịghị osisi junipa niile
nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya,
osisi plenụ niile
adịghịkwa ka alaka ya,
ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige,
nke yiri ya nʼịma mma ya
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.