Izikiel 31:8
Ezekiel 31:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige erughị ya nʼọtụtụ. Ọ dịghị osisi junipa niile nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya, osisi plenụ niile adịghịkwa ka alaka ya, ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige, nke yiri ya nʼịma mma ya
Ezekiel 31:8 in English
Ezekiel 31:8 · Berean Standard Bible
The cedars in the garden of God could not rival it; the cypresses * could not compare with its branches, nor the plane trees * match its boughs. No tree in the garden of God could compare with its beauty.
Context
6Nʼalaka ya niile
ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ,
nʼokpuru ndo nke alaka ya niile
ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ,
oke mba niile dị iche iche
bikwara nʼokpuru ndo ya. 7Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya,
nʼogologo nke alaka ya nʼawasa,
nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba
nʼebe mmiri dị ukwuu. 8Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige
erughị ya nʼọtụtụ.
Ọ dịghị osisi junipa niile
nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya,
osisi plenụ niile
adịghịkwa ka alaka ya,
ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige,
nke yiri ya nʼịma mma ya 9Emere m ya ka ọ maa mma
site nʼịba ụba nke alaka o nwere,
ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIden
nʼubi Chineke a gbara ogige. 10“ ‘Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na o* toro ogologo tokarịa osisi ọhịa niile, nʼihi na ọ nyara isi banyere ọnọdụ ịdị ogologo ya karịa ndị ọzọ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.