Izikiel 31:9
Ezekiel 31:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emere m ya ka ọ maa mma site nʼịba ụba nke alaka o nwere, ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIden nʼubi Chineke a gbara ogige.
Ezekiel 31:9 in English
Ezekiel 31:9 · Berean Standard Bible
I made it beautiful with its many branches, the envy of all the trees of Eden, which were in the garden of God.’
Context
7Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya,
nʼogologo nke alaka ya nʼawasa,
nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba
nʼebe mmiri dị ukwuu. 8Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige
erughị ya nʼọtụtụ.
Ọ dịghị osisi junipa niile
nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya,
osisi plenụ niile
adịghịkwa ka alaka ya,
ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige,
nke yiri ya nʼịma mma ya 9Emere m ya ka ọ maa mma
site nʼịba ụba nke alaka o nwere,
ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIden
nʼubi Chineke a gbara ogige. 10“ ‘Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na o* toro ogologo tokarịa osisi ọhịa niile, nʼihi na ọ nyara isi banyere ọnọdụ ịdị ogologo ya karịa ndị ọzọ, 11Eweere m ya nyefee nʼaka onye ahụ na-achị mba niile, ka o mesie ya ike, dịka ịba ụba nke ajọ omume ya si dị. Ewezugakwara m ya nʼakụkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.