Izikiel 31:7
Ezekiel 31:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya, nʼogologo nke alaka ya nʼawasa, nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba nʼebe mmiri dị ukwuu.
Ezekiel 31:7 in English
Ezekiel 31:7 · Berean Standard Bible
It was beautiful in its greatness, in the length of its limbs, for its roots extended to abundant waters.
Context
5Nʼihi ya, o toro tokarịa
osisi niile nʼogologo.
Ngalaba ya bara ụba,
alaka ya topụkwara ogologo
nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta. 6Nʼalaka ya niile
ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ,
nʼokpuru ndo nke alaka ya niile
ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ,
oke mba niile dị iche iche
bikwara nʼokpuru ndo ya. 7Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya,
nʼogologo nke alaka ya nʼawasa,
nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba
nʼebe mmiri dị ukwuu. 8Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige
erughị ya nʼọtụtụ.
Ọ dịghị osisi junipa niile
nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya,
osisi plenụ niile
adịghịkwa ka alaka ya,
ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige,
nke yiri ya nʼịma mma ya 9Emere m ya ka ọ maa mma
site nʼịba ụba nke alaka o nwere,
ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIden
nʼubi Chineke a gbara ogige.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.