Izikiel 26:18
Ezekiel 26:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, lee na ala niile dị nʼọnụ mmiri nke osimiri na-ama jijiji nʼihi ọdịda gị. Ọ bụladị agwa etiti niile ka ụjọ juru obi nʼihi nkwatu a kwatụrụ gị.’
Ezekiel 26:18 in English
Ezekiel 26:18 · Berean Standard Bible
Now the coastlands tremble on the day of your downfall; the islands in the sea are dismayed by your demise.”’
Context
16Mgbe ahụ, ndị ndu nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri ga-esi nʼocheeze ha rịdata. Ha ga-eyipụ uwe mwụda ha, yipụsịakwa uwe ha niile a kpara nke ọma. Ha ga-anọdụ ọdụ nʼala na-ama jijiji site nʼoke egwu nʼihi ihe ha hụrụ dakwasịrị gị. 17Ha ga-ebulikwa abụ akwa banyere gị, sị gị,
“ ‘Lee ka i si laa nʼiyi, gị obodo a maara aha ya,
nke ndị na-ejegharị nʼosimiri bi nʼime ya.
Na mbụ, ị bụ obodo nke ịdị ike ya pụtara ihe nʼosimiri niile,
gị na ndị bi nʼime gị.
Ị na-emenyekwa
ndị bi nʼime ya egwu. 18Ugbu a, lee na ala niile dị nʼọnụ mmiri nke osimiri
na-ama jijiji nʼihi ọdịda gị.
Ọ bụladị agwa etiti niile ka ụjọ juru obi
nʼihi nkwatu a kwatụrụ gị.’ 19“Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe m mere ka ị ghọọ obodo tọgbọrọ nʼefu, dịka obodo niile nke mmadụ na-ebighị, mgbe m mekwara ka ogbu mmiri nke oke osimiri bịakwasị gị, mgbe ọtụtụ mmiri ya kpuchiri gị, 20mgbe ahụ ka m ga-eme ka ị rịdaruo nʼala mmụọ, gị na ndị na-arịda nʼolulu, ka i jekwuru ndị mgbe ochie. Aga m eme ka ebe obibi gị bụrụ nʼokpuru ime ime ala, ka ị dịrị ka obodo ndị ochie ahụ e tikpọrọ etikpọ. Gị na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ị gaghị esitekwa nʼebe ahụ lọghachi ịbịa isoro ndị dị ndụ birikwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.