Izikiel 26:17
Ezekiel 26:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-ebulikwa abụ akwa banyere gị, sị gị, “ ‘Lee ka i si laa nʼiyi, gị obodo a maara aha ya, nke ndị na-ejegharị nʼosimiri bi nʼime ya. Na mbụ, ị bụ obodo nke ịdị ike ya pụtara ihe nʼosimiri niile, gị na ndị bi nʼime gị. Ị na-emenyekwa ndị bi nʼime ya egwu.
Ezekiel 26:17 in English
Ezekiel 26:17 · Berean Standard Bible
Then they will lament for you, saying, “How you have perished, O city of renown inhabited by seafaring men— she who was powerful on the sea, along with her people, who imposed terror on all peoples!*
Context
15“Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Taịa, Ọ bụ na agaghị anụ mkpọtụ ọdịda gị na mba ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri, mgbe ndị e merụrụ ahụ ga na-asụ ude nʼoge a na-egbu ndị bi nʼime gị? 16Mgbe ahụ, ndị ndu nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri ga-esi nʼocheeze ha rịdata. Ha ga-eyipụ uwe mwụda ha, yipụsịakwa uwe ha niile a kpara nke ọma. Ha ga-anọdụ ọdụ nʼala na-ama jijiji site nʼoke egwu nʼihi ihe ha hụrụ dakwasịrị gị. 17Ha ga-ebulikwa abụ akwa banyere gị, sị gị,
“ ‘Lee ka i si laa nʼiyi, gị obodo a maara aha ya,
nke ndị na-ejegharị nʼosimiri bi nʼime ya.
Na mbụ, ị bụ obodo nke ịdị ike ya pụtara ihe nʼosimiri niile,
gị na ndị bi nʼime gị.
Ị na-emenyekwa
ndị bi nʼime ya egwu. 18Ugbu a, lee na ala niile dị nʼọnụ mmiri nke osimiri
na-ama jijiji nʼihi ọdịda gị.
Ọ bụladị agwa etiti niile ka ụjọ juru obi
nʼihi nkwatu a kwatụrụ gị.’ 19“Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe m mere ka ị ghọọ obodo tọgbọrọ nʼefu, dịka obodo niile nke mmadụ na-ebighị, mgbe m mekwara ka ogbu mmiri nke oke osimiri bịakwasị gị, mgbe ọtụtụ mmiri ya kpuchiri gị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.