Izikiel 23:32
Ezekiel 23:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “Iko nwanne gị nwanyị ka ị ga-aṅụ bụ iko sara mbara ma dịkwa omimi; nke ga-eme ka ị ghọọ onye a na-achị ọchị na onye a na-akwa emo, nʼihi na ọ na-anagide ihe dị ukwuu.
Ezekiel 23:32 in English
Ezekiel 23:32 · Berean Standard Bible
This is what the Lord GOD says: ‘You will drink your sister’s cup, a cup deep and wide. It will bring scorn and derision, for it holds so much.
Context
30emeela ka ihe ndị a bịakwasị gị, nʼihi na agụụ mmekọrịta nʼebe mba ndị ọzọ gụrụ gị, ị jikwa arụsị ha merụọ onwe gị. 31Ị gbasoro nzọ ụkwụ nwanne gị nwanyị, nʼihi ya, aga m ewere iko ya tinye gị nʼaka.* 32“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru:
“Iko nwanne gị nwanyị ka ị ga-aṅụ
bụ iko sara mbara ma dịkwa omimi;
nke ga-eme ka ị ghọọ onye a na-achị ọchị na onye a na-akwa emo,
nʼihi na ọ na-anagide ihe dị ukwuu. 33Ị ga-ejupụta nʼịṅụbiga mmanya oke na iru ụjụ,
nʼihi iko mbibi na ntikpọsi,
bụ iko nke nwanne gị nwanyị bụ Sameria. 34Ị ga-aṅụ ya, ṅụchaa ihe dị nʼiko ahụ.
Ị ga-atapịakwa iberibe* ya niile,
dọkasịakwa ara gị abụọ.
Ekwuola m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.