Izikiel 23:31
Ezekiel 23:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị gbasoro nzọ ụkwụ nwanne gị nwanyị, nʼihi ya, aga m ewere iko ya tinye gị nʼaka.*
Ezekiel 23:31 in English
Ezekiel 23:31 · Berean Standard Bible
Because you have followed the path of your sister, I will put her cup into your hand.’
Context
29Ha ga-esite nʼịkpọ asị mesie gị ike, pụnara gị ihe niile i nwere nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ha. Ha ga-ahapụ gị ka ịgbara ọtọ ihu na azụ, mgbe ahụ ihere nke ịgba akwụna gị ga-apụta ihe. Agụụ nke ọchịchọ ọjọọ na ịkwa iko gị 30emeela ka ihe ndị a bịakwasị gị, nʼihi na agụụ mmekọrịta nʼebe mba ndị ọzọ gụrụ gị, ị jikwa arụsị ha merụọ onwe gị. 31Ị gbasoro nzọ ụkwụ nwanne gị nwanyị, nʼihi ya, aga m ewere iko ya tinye gị nʼaka.* 32“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru:
“Iko nwanne gị nwanyị ka ị ga-aṅụ
bụ iko sara mbara ma dịkwa omimi;
nke ga-eme ka ị ghọọ onye a na-achị ọchị na onye a na-akwa emo,
nʼihi na ọ na-anagide ihe dị ukwuu. 33Ị ga-ejupụta nʼịṅụbiga mmanya oke na iru ụjụ,
nʼihi iko mbibi na ntikpọsi,
bụ iko nke nwanne gị nwanyị bụ Sameria.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.