Izikiel 23:34
Ezekiel 23:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-aṅụ ya, ṅụchaa ihe dị nʼiko ahụ. Ị ga-atapịakwa iberibe* ya niile, dọkasịakwa ara gị abụọ. Ekwuola m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Ezekiel 23:34 in English
Ezekiel 23:34 · Berean Standard Bible
You will drink it and drain it; you will dash it to pieces, and tear your breasts. For I have spoken,’ declares the Lord GOD.
Context
32“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru:
“Iko nwanne gị nwanyị ka ị ga-aṅụ
bụ iko sara mbara ma dịkwa omimi;
nke ga-eme ka ị ghọọ onye a na-achị ọchị na onye a na-akwa emo,
nʼihi na ọ na-anagide ihe dị ukwuu. 33Ị ga-ejupụta nʼịṅụbiga mmanya oke na iru ụjụ,
nʼihi iko mbibi na ntikpọsi,
bụ iko nke nwanne gị nwanyị bụ Sameria. 34Ị ga-aṅụ ya, ṅụchaa ihe dị nʼiko ahụ.
Ị ga-atapịakwa iberibe* ya niile,
dọkasịakwa ara gị abụọ.
Ekwuola m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 35“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na i chefuola m, gbakụta m azụ gị, ị ga-ata ahụhụ niile ruuru gị nʼihi mmehie, agụụ ọchịchọ ọjọọ na ịgba akwụna gị.” 36Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe Ohola na Oholiba ikpe? Mgbe ahụ, guzogide ha mee ka ha mara ihe arụ niile ha na-eme.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.