Native Bible

Ezekiel 19:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ma kwuo, “ ‘Ụdị nne Ọdụm gịnị ka nne gị bụ nʼetiti ụmụ ọdụm. Ọ dinara nʼetiti ha, na-azụ ụmụ ya.

Ezekiel 19:2 in English

Ezekiel 19:2 · Berean Standard Bible

and say: ‘What was your mother? A lioness among the lions! She lay down among the young lions; she reared her cubs.

Context

1“Ma gị onwe gị, bụọrọnụ ndịisi Izrel abụ akwa a, 2ma kwuo, “ ‘Ụdị nne Ọdụm gịnị ka nne gị bụ nʼetiti ụmụ ọdụm. Ọ dinara nʼetiti ha, na-azụ ụmụ ya. 3Ọ zụlitere otu nʼime ụmụ ya nke ghọrọ nwa ọdụm siri ike. Ọ mụtakwara ka e si adọrisi anụ ọhịa, ghọọ ọdụm na-eri mmadụ. 4Mba niile nụrụ maka ihe banyere ya, mee ka ọ danye nʼolulu ha gwuru. Ha ji nko koro ya, duru ya gaa nʼala Ijipt.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.