Izikiel 19:4
Ezekiel 19:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mba niile nụrụ maka ihe banyere ya, mee ka ọ danye nʼolulu ha gwuru. Ha ji nko koro ya, duru ya gaa nʼala Ijipt.
Ezekiel 19:4 in English
Ezekiel 19:4 · Berean Standard Bible
When the nations heard of him, he was trapped in their pit. With hooks they led him away to the land of Egypt.
Context
2ma kwuo,
“ ‘Ụdị nne Ọdụm gịnị ka nne gị bụ
nʼetiti ụmụ ọdụm.
Ọ dinara nʼetiti ha,
na-azụ ụmụ ya. 3Ọ zụlitere otu nʼime ụmụ ya
nke ghọrọ nwa ọdụm siri ike.
Ọ mụtakwara ka e si adọrisi anụ ọhịa,
ghọọ ọdụm na-eri mmadụ. 4Mba niile nụrụ maka ihe banyere ya,
mee ka ọ danye nʼolulu ha gwuru.
Ha ji nko koro ya,
duru ya gaa nʼala Ijipt. 5“ ‘Mgbe ọ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe ọzọ o nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ,
matakwa na olileanya ya abụrụla ihe efu,
ọ họpụtara nwa ya ọzọ
kuziere ya otu ọ ga-esi bụrụ ọdụm dị ike. 6Ọ ghọrọ onyeisi ụmụ ọdụm niile,
nʼihi na ọ bụ ọdụm siri ike,
ọ mụtakwara ka e si ejide anụ ọhịa,
ya onwe ya ghọkwara ọdụm na-eri mmadụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.