Native Bible

Ezekiel 19:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Mgbe ọ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe ọzọ o nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ, matakwa na olileanya ya abụrụla ihe efu, ọ họpụtara nwa ya ọzọ kuziere ya otu ọ ga-esi bụrụ ọdụm dị ike.

Ezekiel 19:5 in English

Ezekiel 19:5 · Berean Standard Bible

When she saw that she had waited in vain, that her hope was lost, she took another of her cubs and made him a young lion.

Context

3Ọ zụlitere otu nʼime ụmụ ya nke ghọrọ nwa ọdụm siri ike. Ọ mụtakwara ka e si adọrisi anụ ọhịa, ghọọ ọdụm na-eri mmadụ. 4Mba niile nụrụ maka ihe banyere ya, mee ka ọ danye nʼolulu ha gwuru. Ha ji nko koro ya, duru ya gaa nʼala Ijipt. 5“ ‘Mgbe ọ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe ọzọ o nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ, matakwa na olileanya ya abụrụla ihe efu, ọ họpụtara nwa ya ọzọ kuziere ya otu ọ ga-esi bụrụ ọdụm dị ike. 6Ọ ghọrọ onyeisi ụmụ ọdụm niile, nʼihi na ọ bụ ọdụm siri ike, ọ mụtakwara ka e si ejide anụ ọhịa, ya onwe ya ghọkwara ọdụm na-eri mmadụ. 7O tikpọrọ ebe ha niile e wusiri ike meekwa obodo ha niile mkpọmkpọ ebe. Ala ahụ na ndị niile nọ nʼime ya, mara jijiji site nʼoke egwu nʼihi olu ịgbọ ụja ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.