Izikiel 19:5
Ezekiel 19:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Mgbe ọ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe ọzọ o nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ, matakwa na olileanya ya abụrụla ihe efu, ọ họpụtara nwa ya ọzọ kuziere ya otu ọ ga-esi bụrụ ọdụm dị ike.
Ezekiel 19:5 in English
Ezekiel 19:5 · Berean Standard Bible
When she saw that she had waited in vain, that her hope was lost, she took another of her cubs and made him a young lion.
Context
3Ọ zụlitere otu nʼime ụmụ ya
nke ghọrọ nwa ọdụm siri ike.
Ọ mụtakwara ka e si adọrisi anụ ọhịa,
ghọọ ọdụm na-eri mmadụ. 4Mba niile nụrụ maka ihe banyere ya,
mee ka ọ danye nʼolulu ha gwuru.
Ha ji nko koro ya,
duru ya gaa nʼala Ijipt. 5“ ‘Mgbe ọ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe ọzọ o nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ,
matakwa na olileanya ya abụrụla ihe efu,
ọ họpụtara nwa ya ọzọ
kuziere ya otu ọ ga-esi bụrụ ọdụm dị ike. 6Ọ ghọrọ onyeisi ụmụ ọdụm niile,
nʼihi na ọ bụ ọdụm siri ike,
ọ mụtakwara ka e si ejide anụ ọhịa,
ya onwe ya ghọkwara ọdụm na-eri mmadụ. 7O tikpọrọ ebe ha niile e wusiri ike
meekwa obodo ha niile mkpọmkpọ ebe.
Ala ahụ na ndị niile nọ nʼime ya,
mara jijiji site nʼoke egwu nʼihi olu ịgbọ ụja ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.