Izikiel 19:7
Ezekiel 19:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O tikpọrọ ebe ha niile e wusiri ike meekwa obodo ha niile mkpọmkpọ ebe. Ala ahụ na ndị niile nọ nʼime ya, mara jijiji site nʼoke egwu nʼihi olu ịgbọ ụja ya.
Ezekiel 19:7 in English
Ezekiel 19:7 · Berean Standard Bible
He broke down their strongholds * and devastated their cities. The land and everything in it shuddered at the sound of his roaring.
Context
5“ ‘Mgbe ọ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe ọzọ o nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ,
matakwa na olileanya ya abụrụla ihe efu,
ọ họpụtara nwa ya ọzọ
kuziere ya otu ọ ga-esi bụrụ ọdụm dị ike. 6Ọ ghọrọ onyeisi ụmụ ọdụm niile,
nʼihi na ọ bụ ọdụm siri ike,
ọ mụtakwara ka e si ejide anụ ọhịa,
ya onwe ya ghọkwara ọdụm na-eri mmadụ. 7O tikpọrọ ebe ha niile e wusiri ike
meekwa obodo ha niile mkpọmkpọ ebe.
Ala ahụ na ndị niile nọ nʼime ya,
mara jijiji site nʼoke egwu nʼihi olu ịgbọ ụja ya. 8Mgbe ahụ, ndị agha nke mba niile dị iche iche
pụtara gbaa ya gburugburu.
Ha sitere nʼakụkụ niile nwude ya
nʼọnya olulu ha siiri ya. 9Ha tinyere ya nko nʼimi, were dọkpuo ya nʼụlọ igwe a kpara akpa,
bute ya nʼihu eze Babilọn.
E mere ka o biri na mba ọzọ dịka ohu,
ka a ghara ịnụ ụda olu ya ọzọ
nʼugwu niile nke Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.