Izikiel 19:8
Ezekiel 19:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị agha nke mba niile dị iche iche pụtara gbaa ya gburugburu. Ha sitere nʼakụkụ niile nwude ya nʼọnya olulu ha siiri ya.
Ezekiel 19:8 in English
Ezekiel 19:8 · Berean Standard Bible
Then the nations set out against him from the provinces on every side. They spread their net over him; he was trapped in their pit.
Context
6Ọ ghọrọ onyeisi ụmụ ọdụm niile,
nʼihi na ọ bụ ọdụm siri ike,
ọ mụtakwara ka e si ejide anụ ọhịa,
ya onwe ya ghọkwara ọdụm na-eri mmadụ. 7O tikpọrọ ebe ha niile e wusiri ike
meekwa obodo ha niile mkpọmkpọ ebe.
Ala ahụ na ndị niile nọ nʼime ya,
mara jijiji site nʼoke egwu nʼihi olu ịgbọ ụja ya. 8Mgbe ahụ, ndị agha nke mba niile dị iche iche
pụtara gbaa ya gburugburu.
Ha sitere nʼakụkụ niile nwude ya
nʼọnya olulu ha siiri ya. 9Ha tinyere ya nko nʼimi, were dọkpuo ya nʼụlọ igwe a kpara akpa,
bute ya nʼihu eze Babilọn.
E mere ka o biri na mba ọzọ dịka ohu,
ka a ghara ịnụ ụda olu ya ọzọ
nʼugwu niile nke Izrel. 10“ ‘Nne gị dịka osisi vaịnị nʼogige vaịnị
a kụrụ nʼakụkụ mmiri,
nke nwere ọtụtụ alaka, nke na-amịkwa mkpụrụ
nʼihi mmiri ọ na-enweta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.