Izikiel 18:5
Ezekiel 18:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụrụ na-enwere otu onye ezi omume nke na-eme naanị ihe ziri ezi na ihe dị mma,
Ezekiel 18:5 in English
Ezekiel 18:5 · Berean Standard Bible
Now suppose a man is righteous and does what is just and right:
Context
3“Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, unu agaghị atụkwa ilu a ọzọ nʼala Izrel. 4Nʼihi na mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, ha niile bụ nke m. Mkpụrụobi ọbụla mehiere bụ nke ga-anwụ. 5“Ọ bụrụ na-enwere otu onye ezi omume
nke na-eme naanị ihe ziri ezi na ihe dị mma, 6onye na-adịghị eje nʼugwu iri oriri
maọbụ welie anya ya nʼebe arụsị niile nke Izrel dị,
onye na-adịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya,
maọbụ dinakwuru nwanyị nọ nʼoge nsọ ya. 7Onye na-adịghị emegbu ndị mmadụ,
kama ọ na-akwụghachi ụgwọ o ji, maọbụ na-enyeghachi ihe ọ naara dịka ihe mbe,
ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike,
kama ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri,
na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.