Izikiel 18:6
Ezekiel 18:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
onye na-adịghị eje nʼugwu iri oriri maọbụ welie anya ya nʼebe arụsị niile nke Izrel dị, onye na-adịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya, maọbụ dinakwuru nwanyị nọ nʼoge nsọ ya.
Ezekiel 18:6 in English
Ezekiel 18:6 · Berean Standard Bible
He does not eat at the mountain or look to the idols of the house of Israel. He does not defile his neighbor’s wife or approach a woman during her period.
Context
4Nʼihi na mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, ha niile bụ nke m. Mkpụrụobi ọbụla mehiere bụ nke ga-anwụ. 5“Ọ bụrụ na-enwere otu onye ezi omume
nke na-eme naanị ihe ziri ezi na ihe dị mma, 6onye na-adịghị eje nʼugwu iri oriri
maọbụ welie anya ya nʼebe arụsị niile nke Izrel dị,
onye na-adịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya,
maọbụ dinakwuru nwanyị nọ nʼoge nsọ ya. 7Onye na-adịghị emegbu ndị mmadụ,
kama ọ na-akwụghachi ụgwọ o ji, maọbụ na-enyeghachi ihe ọ naara dịka ihe mbe,
ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike,
kama ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri,
na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi. 8Ọ dịghị agbazinye mmadụ ego nara mụrụ nwa,
ọ dịghị ana ụma site nʼaka ha.
Ọ na-esite nʼihe ọjọọ sepụ aka ya,
na-ekpekwa ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ na ibe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.