Izikiel 1:4
Ezekiel 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Elere m anya hụ oke ifufe nke si nʼugwu na-abịa, ahụkwara m oke igwe ojii na amụma nke na-egbuke egbuke; ìhè nke na-enwu nnọọ vaa gbara ya gburugburu. Etiti ọkụ ahụ nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amụke.
Ezekiel 1:4 in English
Ezekiel 1:4 · Berean Standard Bible
I looked and saw a whirlwind coming from the north, a great cloud with fire flashing back and forth and brilliant light all around it. In the center of the fire was a gleam like amber,*
Context
2Nʼụbọchị nke ise nʼọnwa ahụ, ọ bụ nʼafọ nke ise mgbe a dọkpụụrụ eze Jehoiakin jee mba ọzọ, 3okwu Onyenwe anyị ruru Izikiel onye nchụaja nwa Buzi ntị, mgbe ọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, nke dị nʼala ndị Kaldịa.* Nʼebe ahụ kwa ka aka Onyenwe anyị nọ dịkwasị ya nʼahụ. 4Elere m anya hụ oke ifufe nke si nʼugwu na-abịa, ahụkwara m oke igwe ojii na amụma nke na-egbuke egbuke; ìhè nke na-enwu nnọọ vaa gbara ya gburugburu. Etiti ọkụ ahụ nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amụke. 5Ihe e kere eke anọ dị ndụ, nke yiri mmadụ nʼụdịdị ha, nọkwa nʼetiti oke ihe ahụ. 6Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ, na nku anọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.