Native Bible

Ezekiel 1:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

okwu Onyenwe anyị ruru Izikiel onye nchụaja nwa Buzi ntị, mgbe ọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, nke dị nʼala ndị Kaldịa.* Nʼebe ahụ kwa ka aka Onyenwe anyị nọ dịkwasị ya nʼahụ.

Ezekiel 1:3 in English

Ezekiel 1:3 · Berean Standard Bible

the word of the LORD came directly to Ezekiel the priest, the son of Buzi, in the land of the Chaldeans * by the River Kebar. And there the LORD’s hand was upon him.

Context

1O ruo nʼafọ nke iri atọ, nʼọnwa nke anọ, nʼụbọchị nke ise ya, mgbe mụ onwe m na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri na mba ọzọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, na e meghere eluigwe mee ka m hụ ọhụ dị iche iche site nʼaka Chineke. 2Nʼụbọchị nke ise nʼọnwa ahụ, ọ bụ nʼafọ nke ise mgbe a dọkpụụrụ eze Jehoiakin jee mba ọzọ, 3okwu Onyenwe anyị ruru Izikiel onye nchụaja nwa Buzi ntị, mgbe ọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, nke dị nʼala ndị Kaldịa.* Nʼebe ahụ kwa ka aka Onyenwe anyị nọ dịkwasị ya nʼahụ. 4Elere m anya hụ oke ifufe nke si nʼugwu na-abịa, ahụkwara m oke igwe ojii na amụma nke na-egbuke egbuke; ìhè nke na-enwu nnọọ vaa gbara ya gburugburu. Etiti ọkụ ahụ nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amụke. 5Ihe e kere eke anọ dị ndụ, nke yiri mmadụ nʼụdịdị ha, nọkwa nʼetiti oke ihe ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.