Native Bible

Ezekiel 1:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụbọchị nke ise nʼọnwa ahụ, ọ bụ nʼafọ nke ise mgbe a dọkpụụrụ eze Jehoiakin jee mba ọzọ,

Ezekiel 1:2 in English

Ezekiel 1:2 · Berean Standard Bible

On the fifth day of the month—it was the fifth year of the exile of King Jehoiachin—

Context

1O ruo nʼafọ nke iri atọ, nʼọnwa nke anọ, nʼụbọchị nke ise ya, mgbe mụ onwe m na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri na mba ọzọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, na e meghere eluigwe mee ka m hụ ọhụ dị iche iche site nʼaka Chineke. 2Nʼụbọchị nke ise nʼọnwa ahụ, ọ bụ nʼafọ nke ise mgbe a dọkpụụrụ eze Jehoiakin jee mba ọzọ, 3okwu Onyenwe anyị ruru Izikiel onye nchụaja nwa Buzi ntị, mgbe ọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, nke dị nʼala ndị Kaldịa.* Nʼebe ahụ kwa ka aka Onyenwe anyị nọ dịkwasị ya nʼahụ. 4Elere m anya hụ oke ifufe nke si nʼugwu na-abịa, ahụkwara m oke igwe ojii na amụma nke na-egbuke egbuke; ìhè nke na-enwu nnọọ vaa gbara ya gburugburu. Etiti ọkụ ahụ nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amụke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.