Native Bible

Ezekiel 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ, na nku anọ.

Ezekiel 1:6 in English

Ezekiel 1:6 · Berean Standard Bible

but each had four faces and four wings.

Context

4Elere m anya hụ oke ifufe nke si nʼugwu na-abịa, ahụkwara m oke igwe ojii na amụma nke na-egbuke egbuke; ìhè nke na-enwu nnọọ vaa gbara ya gburugburu. Etiti ọkụ ahụ nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amụke. 5Ihe e kere eke anọ dị ndụ, nke yiri mmadụ nʼụdịdị ha, nọkwa nʼetiti oke ihe ahụ. 6Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ, na nku anọ. 7Ụkwụ ha guzoro kwem; ọbụ ụkwụ ha dịka nke nwa ehi, na-amụkekwa dịka bronz e hichara nke ọma. 8Nʼokpuru nku ha, ha nwere aka yiri aka mmadụ nʼakụkụ anọ ha niile. Otu a ka ihu ha na nku anọ dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.