Native Bible

Exodus 25:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Wuo ụlọ nzute a na ihe ịchọ ya mma niile, ka ọ bụrụ otu ihe dịka oyiyi m ga-egosi gị.

Exodus 25:9 in English

Exodus 25:9 · Berean Standard Bible

You must make the tabernacle and design all its furnishings according to the pattern I show you.

Context

7nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd,* na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi. 8“Mee ka ha wuoro m ebe nsọ. Mụ onwe m ga-ebikwa nʼetiti ha. 9Wuo ụlọ nzute a na ihe ịchọ ya mma niile, ka ọ bụrụ otu ihe dịka oyiyi m ga-egosi gị. 10“Ha ga-eji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya ga-abụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya bụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ. 11Machie ọlaedo a nụchara anụcha nʼime na azụ ya niile, jiri ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.