Ọpụpụ 25:37
Exodus 25:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ị ga-eme oriọna asaa, dọba ha nʼelu ihe ịdọkwasị iheọkụ ahụ, ka ha na-enye ìhè naanị nʼebe ihu ya.
Exodus 25:37 in English
Exodus 25:37 · Berean Standard Bible
Make seven lamps and set them up on the lampstand so that they illuminate the area in front of it.
Context
35Otu isi ga-adịkwa nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta. Isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ. Isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii. 36Isi nwapụta ya na alaka ya niile ga-adịkọtakwa ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ. 37“Ị ga-eme oriọna asaa, dọba ha nʼelu ihe ịdọkwasị iheọkụ ahụ, ka ha na-enye ìhè naanị nʼebe ihu ya. 38Mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile, ga-abụ ọlaedo a nụchara anụcha. 39Ọlaedo a nụchara anụcha nke dị iri kilogram atọ na anọ ka a ga-eji kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna ahụ na ngwongwo ndị a niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.