Native Bible

Exodus 25:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Isi nwapụta ya na alaka ya niile ga-adịkọtakwa ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ.

Exodus 25:36 in English

Exodus 25:36 · Berean Standard Bible

The buds and branches are to be all of one piece with the lampstand, hammered out of pure gold.

Context

34Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, ọ ga-adị iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya. 35Otu isi ga-adịkwa nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta. Isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ. Isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii. 36Isi nwapụta ya na alaka ya niile ga-adịkọtakwa ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ. 37“Ị ga-eme oriọna asaa, dọba ha nʼelu ihe ịdọkwasị iheọkụ ahụ, ka ha na-enye ìhè naanị nʼebe ihu ya. 38Mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile, ga-abụ ọlaedo a nụchara anụcha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.