Ọpụpụ 23:18
Exodus 23:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nʼihu m. “Maọbụ hapụ abụba nke aja mmemme m ka ọ dịgide ruo ụtụtụ.*
Exodus 23:18 in English
Exodus 23:18 · Berean Standard Bible
You must not offer the blood of My sacrifices with anything leavened, nor may the fat of My feast remain until morning.
Context
16“Mee Mmemme Owuwe Ihe ubi,* bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ihe niile ị kụrụ nʼubi unu.
“Meekwanụ Mmemme Nchịkọta Ihe, nʼọgwụgwụ afọ ọbụla.* Mgbe unu si nʼubi na-achịbata mkpụrụ ubi unu niile. 17“Ugbo atọ nʼafọ ka ndị ikom niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. 18“Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nʼihu m.
“Maọbụ hapụ abụba nke aja mmemme m ka ọ dịgide ruo ụtụtụ.* 19“Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
“Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.* 20“Lee, ana m eziga mmụọ ozi nʼihu unu, ichebe unu nʼije unu nakwa ịkpọbatakwa unu nʼebe ahụ M doziri nye unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.