Native Bible

Exodus 23:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Mee Mmemme Owuwe Ihe ubi,* bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ihe niile ị kụrụ nʼubi unu. “Meekwanụ Mmemme Nchịkọta Ihe, nʼọgwụgwụ afọ ọbụla.* Mgbe unu si nʼubi na-achịbata mkpụrụ ubi unu niile.

Exodus 23:16 in English

Exodus 23:16 · Berean Standard Bible

You are also to keep the Feast of Harvest * with the firstfruits of the produce from what you sow in the field. And keep the Feast of Ingathering * at the end of the year, when you gather your produce from the field.

Context

14“Ugboro atọ nʼafọ ka unu ga-emere m mmemme a. 15“Meenụ Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha nke e jighị ihe na-eko achịcha mee. Unu ga-eri ya na mgbe a kara aka, nʼọnwa Abib. Nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta. “Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu m. 16“Mee Mmemme Owuwe Ihe ubi,* bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ihe niile ị kụrụ nʼubi unu. “Meekwanụ Mmemme Nchịkọta Ihe, nʼọgwụgwụ afọ ọbụla.* Mgbe unu si nʼubi na-achịbata mkpụrụ ubi unu niile. 17“Ugbo atọ nʼafọ ka ndị ikom niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. 18“Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nʼihu m. “Maọbụ hapụ abụba nke aja mmemme m ka ọ dịgide ruo ụtụtụ.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.