Native Bible

Exodus 23:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ugboro atọ nʼafọ ka unu ga-emere m mmemme a.

Exodus 23:14 in English

Exodus 23:14 · Berean Standard Bible

Three times a year you are to celebrate a feast to Me.

Context

12“Ị ga-arụ ọrụ gị niile nʼime ụbọchị isii. Ị ga-ezukwa ike nʼụbọchị nke asaa. Izuike a ga-adịkwara ehi gị na ịnyịnya ibu gị, na ndị ohu gị nọ nʼezinaụlọ gị na ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu. 13“Kpachapụnụ anya hụ na unu mezuru ihe niile ndị a m gwara unu. Unu akpọkwala chi ndị ọzọ aha. Unu ekwupụtakwala ihe banyere ha nʼọnụ unu. 14“Ugboro atọ nʼafọ ka unu ga-emere m mmemme a. 15“Meenụ Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha nke e jighị ihe na-eko achịcha mee. Unu ga-eri ya na mgbe a kara aka, nʼọnwa Abib. Nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta. “Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu m. 16“Mee Mmemme Owuwe Ihe ubi,* bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ihe niile ị kụrụ nʼubi unu. “Meekwanụ Mmemme Nchịkọta Ihe, nʼọgwụgwụ afọ ọbụla.* Mgbe unu si nʼubi na-achịbata mkpụrụ ubi unu niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.