Native Bible

Exodus 23:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.*

Exodus 23:19 in English

Exodus 23:19 · Berean Standard Bible

Bring the best of the firstfruits of your soil to the house of the LORD your God. You must not cook a young goat in its mother’s milk.

Context

17“Ugbo atọ nʼafọ ka ndị ikom niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. 18“Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nʼihu m. “Maọbụ hapụ abụba nke aja mmemme m ka ọ dịgide ruo ụtụtụ.* 19“Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.* 20“Lee, ana m eziga mmụọ ozi nʼihu unu, ichebe unu nʼije unu nakwa ịkpọbatakwa unu nʼebe ahụ M doziri nye unu. 21Geenụ ya ntị, nụrụkwa olu ya. Unu enupukwarala ya isi, nʼihi na ọ gaghị agbaghara njehie unu niile, nʼihi na Aha m dị nʼime ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.