Native Bible

Exodus 23:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Geenụ ya ntị, nụrụkwa olu ya. Unu enupukwarala ya isi, nʼihi na ọ gaghị agbaghara njehie unu niile, nʼihi na Aha m dị nʼime ya.

Exodus 23:21 in English

Exodus 23:21 · Berean Standard Bible

Pay attention to him and listen to his voice; do not defy him, for he will not forgive rebellion, since My Name is in him.

Context

19“Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.* 20“Lee, ana m eziga mmụọ ozi nʼihu unu, ichebe unu nʼije unu nakwa ịkpọbatakwa unu nʼebe ahụ M doziri nye unu. 21Geenụ ya ntị, nụrụkwa olu ya. Unu enupukwarala ya isi, nʼihi na ọ gaghị agbaghara njehie unu niile, nʼihi na Aha m dị nʼime ya. 22Ọ bụrụ na unu elezie anya nke ọma, gee ya ntị, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu, mgbe ahụ, mụ onwe m ga-abụkwara ndị iro unu onye iro, megidekwa ndị na-emegide unu. 23Mmụọ ozi m ga-ejekwa nʼihu unu, ịkpọbatakwa unu nʼala ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Aga m ehichapụ obodo ndị a niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.