Ọpụpụ 16:35
Exodus 16:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Izrel niile riri mánà ndị a iri afọ anọ* tutu ruo mgbe ha batara nʼala ebe ndị mmadụ bi, tutu ruo mgbe ha bịarutere nʼoke ala Kenan.
Exodus 16:35 in English
Exodus 16:35 · Berean Standard Bible
The Israelites ate manna forty years, until they came to a land where they could settle; they ate manna until they reached the border of Canaan.
Context
33Nʼihi nke a, Mosis nyere Erọn iwu sị ya, “Tụrụ ọtụtụ ọmaa mánà tinye ya nʼime ite nta. Bute ya debe ya nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ ihe ga-adịgide nye ọgbọ dị nʼihu.” 34Emesịa, Erọn dọnyere mánà a nʼihu Ihe Ama e debere nʼime ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 35Ndị Izrel niile riri mánà ndị a iri afọ anọ* tutu ruo mgbe ha batara nʼala ebe ndị mmadụ bi, tutu ruo mgbe ha bịarutere nʼoke ala Kenan. 36(Ihe ọtụtụ ọmaa bụ otu ọtụtụ nʼime ọtụtụ iri nke ga-eju ihe ọtụtụ efaf.)
16:13 Ya bụ ọkụkụ ọgazị
16:16 Ya bụ ihe ruru otu kilogram na ụma anọ
16:35 Mánà kwụsịrị isi nʼelu dara ụmụ Izrel, mgbe ha mesịrị mmemme oriri achịcha na-ekoghị eko nʼala Kenan. Jos 5:10-12
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.