Native Bible

Exodus 16:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Erọn dọnyere mánà a nʼihu Ihe Ama e debere nʼime ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

Exodus 16:34 in English

Exodus 16:34 · Berean Standard Bible

And Aaron placed it in front of the Testimony,* to be preserved just as the LORD had commanded Moses.

Context

32Emesịa, Mosis gara nʼihu gwa ha okwu sị, “Onyenwe anyị enyela iwu sị, ‘Na unu ga-eji ihe ọtụtụ ọmaa tụpụta mánà nke unu ga-edebe. Ọ ga-abụ ihe ncheta ga-adịrị ọgbọ ndị Izrel niile na-abịa nʼihu. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ unu ga-ahụ ụdị achịcha m jiri zụọ unu nʼime ọzara mgbe m gbapụtara unu site nʼala ndị Ijipt.’ ” 33Nʼihi nke a, Mosis nyere Erọn iwu sị ya, “Tụrụ ọtụtụ ọmaa mánà tinye ya nʼime ite nta. Bute ya debe ya nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ ihe ga-adịgide nye ọgbọ dị nʼihu.” 34Emesịa, Erọn dọnyere mánà a nʼihu Ihe Ama e debere nʼime ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 35Ndị Izrel niile riri mánà ndị a iri afọ anọ* tutu ruo mgbe ha batara nʼala ebe ndị mmadụ bi, tutu ruo mgbe ha bịarutere nʼoke ala Kenan. 36(Ihe ọtụtụ ọmaa bụ otu ọtụtụ nʼime ọtụtụ iri nke ga-eju ihe ọtụtụ efaf.) 16:13 Ya bụ ọkụkụ ọgazị 16:16 Ya bụ ihe ruru otu kilogram na ụma anọ 16:35 Mánà kwụsịrị isi nʼelu dara ụmụ Izrel, mgbe ha mesịrị mmemme oriri achịcha na-ekoghị eko nʼala Kenan. Jos 5:10-12

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.