Native Bible

Exodus 16:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, Mosis nyere Erọn iwu sị ya, “Tụrụ ọtụtụ ọmaa mánà tinye ya nʼime ite nta. Bute ya debe ya nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ ihe ga-adịgide nye ọgbọ dị nʼihu.”

Exodus 16:33 in English

Exodus 16:33 · Berean Standard Bible

So Moses told Aaron, “Take a jar and fill it with an omer of manna. Then place it before the LORD to be preserved for the generations to come.”

Context

31Ndị Izrel kpọkwara aha nri ahụ ha na-achịkọta mánà. Ọ dị ọcha dịka mkpụrụ kọrianda. Ọ na-atọkwa ụtọ dịka achịcha e ji mmanụ aṅụ mee. 32Emesịa, Mosis gara nʼihu gwa ha okwu sị, “Onyenwe anyị enyela iwu sị, ‘Na unu ga-eji ihe ọtụtụ ọmaa tụpụta mánà nke unu ga-edebe. Ọ ga-abụ ihe ncheta ga-adịrị ọgbọ ndị Izrel niile na-abịa nʼihu. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ unu ga-ahụ ụdị achịcha m jiri zụọ unu nʼime ọzara mgbe m gbapụtara unu site nʼala ndị Ijipt.’ ” 33Nʼihi nke a, Mosis nyere Erọn iwu sị ya, “Tụrụ ọtụtụ ọmaa mánà tinye ya nʼime ite nta. Bute ya debe ya nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ ihe ga-adịgide nye ọgbọ dị nʼihu.” 34Emesịa, Erọn dọnyere mánà a nʼihu Ihe Ama e debere nʼime ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 35Ndị Izrel niile riri mánà ndị a iri afọ anọ* tutu ruo mgbe ha batara nʼala ebe ndị mmadụ bi, tutu ruo mgbe ha bịarutere nʼoke ala Kenan.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.