Ekiliziastis 11:8
Ecclesiastes 11:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ, ya ṅụrịa nʼime ihe niile, ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị ga-adị ọtụtụ. Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu.
Ecclesiastes 11:8 in English
Ecclesiastes 11:8 · Berean Standard Bible
So if a man lives many years, let him rejoice in them all. But let him remember the days of darkness, for they will be many. Everything to come is futile.
Context
6Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ,
esepụkwala aka nʼanyasị,
nʼihi na ị maghị nke ga-eto,
maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ,
ha niile nwere ike too nke ọma. 7Ìhè dị ụtọ,
ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ. 8Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ,
ya ṅụrịa nʼime ihe niile,
ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị
ga-adị ọtụtụ.
Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu. 9Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa.
Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị.*
Mee ihe niile ị chọrọ ime;
gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ.
Kama, ghọtakwa nke a,
na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere. 10Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi,*
wezugakwa nsogbu nke ahụ gị,
nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.
11:9 Akw 3:27
11:10 2Tm 2:22.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.