Ekiliziastis 11:6
Ecclesiastes 11:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ, esepụkwala aka nʼanyasị, nʼihi na ị maghị nke ga-eto, maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ, ha niile nwere ike too nke ọma.
Ecclesiastes 11:6 in English
Ecclesiastes 11:6 · Berean Standard Bible
Sow your seed in the morning, and do not rest your hands in the evening, for you do not know which will succeed, whether this or that, or if both will equally prosper.
Context
4Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla,
onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi. 5Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga
maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime,
otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke,
onye mere ihe niile. 6Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ,
esepụkwala aka nʼanyasị,
nʼihi na ị maghị nke ga-eto,
maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ,
ha niile nwere ike too nke ọma. 7Ìhè dị ụtọ,
ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ. 8Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ,
ya ṅụrịa nʼime ihe niile,
ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị
ga-adị ọtụtụ.
Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.