Ekiliziastis 11:4
Ecclesiastes 11:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla, onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.
Ecclesiastes 11:4 in English
Ecclesiastes 11:4 · Berean Standard Bible
He who watches the wind will fail to sow, and he who observes the clouds will fail to reap.
Context
2Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọ
nʼihi na ị maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo. 3Mgbe eluigwe rujiri,
mmiri ga-ezo;
mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda,
ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ. 4Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla,
onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi. 5Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga
maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime,
otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke,
onye mere ihe niile. 6Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ,
esepụkwala aka nʼanyasị,
nʼihi na ị maghị nke ga-eto,
maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ,
ha niile nwere ike too nke ọma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.