Diuteronomi 5:20
Deuteronomy 5:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị.
Deuteronomy 5:20 in English
Deuteronomy 5:20 · Berean Standard Bible
You shall not bear false witness against your neighbor.*
Context
18Gị akwala iko. 19Gị ezula ohi. 20Gị agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị. 21Gị enwela anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala agụụ inwetara onwe gị ụlọ onye agbataobi gị, maọbụ nʼebe ala ya, maọbụ ohu ya nwoke, maọbụ ohu ya nwanyị, maọbụ ehi ya, maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi nwere dị.” 22Iwu ndị a ka Onyenwe anyị sitere nʼolu ike kwupụta nye ọgbakọ unu niile nʼelu ugwu ahụ, site nʼọkụ ahụ na igwe ojii ahụ na oke ọchịchịrị ahụ. O nweghị okwu ọzọ o tụkwasịrị nʼelu ya. O mechara dee ha na mbadamba nkume abụọ, nye m ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.