Diuteronomi 32:6
Deuteronomy 32:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ otu a ka unu si emeso Onyenwe anyị unu ndị nzuzu, ndị na-enweghị uche? Onyenwe anyị ọ bụghị nna unu, onye kere unu, onye kpụrụ unu mee ka unu guzosie ike?
Deuteronomy 32:6 in English
Deuteronomy 32:6 · Berean Standard Bible
Is this how you repay the LORD, O foolish and senseless people? Is He not your Father and Creator? Has He not made you and established you?
Context
4Ọ bụ oke nkume ahụ, ọrụ ya zuruoke,
ụzọ ya niile ziri ezi.
Chineke kwesiri ntụkwasị obi, nke na-adịghị eme ihe ọjọọ,
onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ. 5Ha emerụọla onwe ha, ha abụkwaghị ụmụ ya,
ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ndị ụdịdị ha gbanwere agbanwe 6Ọ bụ otu a ka unu si emeso Onyenwe anyị
unu ndị nzuzu, ndị na-enweghị uche?
Onyenwe anyị ọ bụghị nna unu, onye kere unu,
onye kpụrụ unu mee ka unu guzosie ike? 7Cheta ụbọchị ochie ndị ahụ gara aga,
tulee ọgbọ ndị ahụ gara aga
jụọ nna gị, ọ ga-akọrọ gị.
Jụọ ndị okenye gị, ha ga-eme ka o doo gị anya. 8Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha,
mgbe o kesara ụmụ mmadụ,
mgbe o guzobere oke ala nye ndị niile
dịka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.